14nʼihi na ya onwe ya maara otu e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ aja.
15Ebe mmadụ nọ, ụbọchị ya niile dị ka ahịhịa, ọ na-etopụta, na-awasa dịka okoko osisi ọhịa,
16ifufe na-efesi ya ike, ọ na-adakwa, adịghị echetakwa ya nʼọnọdụ mbụ ya.
17Ma ịhụnanya Onyenwe anyị na-adịgide site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi nʼetiti ndị na-atụ egwu ya. Ezi omume ya na-adịgidekwara ụmụ ụmụ ha,
18nye ndị ahụ niile na-edebe ọgbụgba ndụ ya na ndị na-echeta irubere ụkpụrụ ya isi.