13Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ, otu a ka Onyenwe anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ,
14nʼihi na ya onwe ya maara otu e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ aja.
15Ebe mmadụ nọ, ụbọchị ya niile dị ka ahịhịa, ọ na-etopụta, na-awasa dịka okoko osisi ọhịa,
16ifufe na-efesi ya ike, ọ na-adakwa, adịghị echetakwa ya nʼọnọdụ mbụ ya.
17Ma ịhụnanya Onyenwe anyị na-adịgide site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi nʼetiti ndị na-atụ egwu ya. Ezi omume ya na-adịgidekwara ụmụ ụmụ ha,