11Nʼihi na dịka eluigwe si dị elu karịa ụwa, otu a ka ịhụnanya ya si dị ukwuu nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ.
12Dịka ọwụwa anyanwụ si dị anya, site nʼọdịda anyanwụ, otu a ka o sirila mee ka mmehie anyị niile dịrị anya site nʼebe anyị nọ.
13Dịka nna si enwe obi ebere nʼebe ụmụ ya nọ, otu a ka Onyenwe anyị si enwe obi ebere nʼebe ndị na-atụ egwu ya nọ,
14nʼihi na ya onwe ya maara otu e si kpụọ anyị, ọ na-echeta na anyị bụ aja.
15Ebe mmadụ nọ, ụbọchị ya niile dị ka ahịhịa, ọ na-etopụta, na-awasa dịka okoko osisi ọhịa,