19tutu ruo mgbe ihe ahụ o kwuru na ọ ga-eme mezuru, tutu ruo mgbe okwu Onyenwe anyị nwapụtara ya dịka onye eziokwu.
20Eze ahụ zipụrụ ozi ka a tọpụ ya, onye ahụ na-achị ndị dị iche iche mere ka o nwere onwe ya.
21O mere ya ka ọ bụrụ onyenwe ezinaụlọ ya, onye na-achị ihe niile o nwere,
22ikuziri ụmụ eze ndị ikom dịka o si masị ya, na izi ndị okenye ya amamihe.
23Mgbe ahụ, Izrel bara nʼala Ijipt; Jekọb bikwara nʼala Ham dịka onye si mba ọzọ bịa.