26O zipụrụ Mosis, ohu ya, na Erọn, onye ọ họpụtara.
27Ha mere ọtụtụ ihe ịrịbama dị iche iche nʼetiti ha, ọrụ ebube ya dị iche iche nʼala Ham.
28O zipụrụ ọchịchịrị, mee ka ala ahụ gbaa ọchịchịrị, nʼihi na ha nupuru isi megide okwu ya.
29O mere ka mmiri ha niile ghọọ ọbara, nke mere ka azụ niile dị nʼime ya nwụsịa.
30Ala ha niile jupụtara nʼawọ ọ bụladị nʼime ọnụụlọ ndina nke ndị na-achị achị.