36Mgbe ahụ, o gburu ndị niile e buru ụzọ mụọ nʼala ahụ, mkpụrụ mbụ nke ndị ikom ha.
37Ọ kpọpụtara ụmụ Izrel, ndị chịịrị ọlaọcha na ọlaedo, ọ dịghị otu onye nʼime ebo ya niile nke ahụ na-esighị ike.
38Obi dị Ijipt ụtọ mgbe ha pụrụ, nʼihi na oke egwu ndị Izrel dakwasịrị ha.
39Ọ gbasara igwe ojii dịka ihe mkpuchi, na ọkụ na-enye ìhè nʼabalị.
40Ha rịọrọ ya, o zitere ha ụmụ nnụnụ kweel, jirikwa achịcha si nʼeluigwe nyejuo ha afọ.