Abụ Ọma 105

O tiwara nkume ahụ, mmiri sọpụtara; ọ sọgharịrị nʼime ọzara dịka iyi.

Psalm 105:41 (UKJV) He opened the rock, and the waters gushed out; they ran in the dry places like a river.

39Ọ gbasara igwe ojii dịka ihe mkpuchi, na ọkụ na-enye ìhè nʼabalị.

40Ha rịọrọ ya, o zitere ha ụmụ nnụnụ kweel, jirikwa achịcha si nʼeluigwe nyejuo ha afọ.

41O tiwara nkume ahụ, mmiri sọpụtara; ọ sọgharịrị nʼime ọzara dịka iyi.

42Nʼihi na o chetara nkwa ya dị nsọ, nke o kwere ohu ya Ebraham.

43O ji aṅụrị dupụta ndị ya, jirikwa ọnọdụ iti mkpu ọṅụ dupụta ndị ya ọ họpụtara;

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.