9Ọ baara Osimiri Uhie mba, ọ tachaa; o dufere ndị ya site nʼebe dị omimi gafee dịka ọ bụ ọzara.
10Ọ zọpụtara ha site nʼaka ndị kpọrọ ha asị; gbapụtakwa ha site nʼaka ndị iro ha.
11Mmiri ahụ riri ndị iro ha niile; ọ dịghị otu onye nʼime ha fọdụrụ.
12Mgbe ahụ, ha kweere okwu gị niile, ma bụkuo gị abụ otuto.
13Ma o teghị aka, ha chefuru ihe niile ọ rụrụ, ha e chereghị ka ndụmọdụ ya pụta ìhè.