10Ọ zọpụtara ha site nʼaka ndị kpọrọ ha asị; gbapụtakwa ha site nʼaka ndị iro ha.
11Mmiri ahụ riri ndị iro ha niile; ọ dịghị otu onye nʼime ha fọdụrụ.
12Mgbe ahụ, ha kweere okwu gị niile, ma bụkuo gị abụ otuto.
13Ma o teghị aka, ha chefuru ihe niile ọ rụrụ, ha e chereghị ka ndụmọdụ ya pụta ìhè.
14Nʼọzara, ha sooro ọchịchọ nke obi ha; nʼala tọgbọrọ nʼefu, ha nwara Chineke ọnwụnwa.