12Mgbe ahụ, ha kweere okwu gị niile, ma bụkuo gị abụ otuto.
13Ma o teghị aka, ha chefuru ihe niile ọ rụrụ, ha e chereghị ka ndụmọdụ ya pụta ìhè.
14Nʼọzara, ha sooro ọchịchọ nke obi ha; nʼala tọgbọrọ nʼefu, ha nwara Chineke ọnwụnwa.
15Nʼihi ya, o nyere ha ihe ha rịọrọ ya, ma zite ọrịa na-efe efe ka ọ dakwasị ha.
16Nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha, ha kworo ekworo megide Mosis na Erọn, ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị.