18Ọkụ repịara ndị niile sonyere ha; ire ọkụ repịara ndị ajọ omume.
19Na Horeb, ha kpụrụ nwa ehi, kpọọ isiala nye arụsị e jiri igwe pịa.
20Ha jiri oyiyi oke ehi nke na-ata ahịhịa gbanwere Ebube ha.
21Ha chefuru Chineke, onye zọpụtara ha, onye rụrụ ọtụtụ ọrụ dị ukwuu nʼIjipt,
22ọtụtụ ihe ịrịbama nʼala Ham, na ọtụtụ ọrụ ịtụnanya nʼakụkụ Osimiri Uhie.