16Nʼetiti ọmụma ụlọ ikwu ha, ha kworo ekworo megide Mosis na Erọn, ndị e doro nsọ nye Onyenwe anyị.
17Ala meghere loda Datan, o likwara Abiram, na ndị otù ya.
18Ọkụ repịara ndị niile sonyere ha; ire ọkụ repịara ndị ajọ omume.
19Na Horeb, ha kpụrụ nwa ehi, kpọọ isiala nye arụsị e jiri igwe pịa.
20Ha jiri oyiyi oke ehi nke na-ata ahịhịa gbanwere Ebube ha.