21Ha chefuru Chineke, onye zọpụtara ha, onye rụrụ ọtụtụ ọrụ dị ukwuu nʼIjipt,
22ọtụtụ ihe ịrịbama nʼala Ham, na ọtụtụ ọrụ ịtụnanya nʼakụkụ Osimiri Uhie.
23Nʼihi ya, o kwuru na ọ ga-ala ha nʼiyi, ma Mosis, onye ya ọ họpụtara, guzoro nʼetiti ndị ahụ na Chineke, ka oke iwe ya ghara ịla ha nʼiyi.
24Emesịa, ha ledara ala ọma ahụ anya, ha ekwenyeghị na nkwa ya.
25Ha tamuru ntamu nʼime ụlọ ikwu ha; ha erubekwaghị isi nye Onyenwe anyị.