27mee ka agbụrụ ha daa nʼetiti mba dị iche iche, ma chụsasịa ha nʼala niile.
28Ha dịnyeere ndị na-efe arụsị Baal nke Peoa, riekwa ihe e ji chụọrọ chi na-enweghị ndụ aja;
29ha sitere nʼajọ omume ha kpasuo Onyenwe anyị iwe, nke mere ka ọrịa na-efe efe dakwasị ha.
30Ma Finehaz guzoro ọtọ, mee ihe ziri ezi, ọrịa ahụ na-efe efe kwụsịkwara.
31A gụnyere nke a dịka ezi omume nye ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.