29ha sitere nʼajọ omume ha kpasuo Onyenwe anyị iwe, nke mere ka ọrịa na-efe efe dakwasị ha.
30Ma Finehaz guzoro ọtọ, mee ihe ziri ezi, ọrịa ahụ na-efe efe kwụsịkwara.
31A gụnyere nke a dịka ezi omume nye ya site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ.
32Nʼakụkụ mmiri Meriba, ha kpasuru Onyenwe anyị iwe, nʼihi ha, nsogbu dakwasịrị Mosis;
33nʼihi na ha nupuru isi megide Mmụọ nke Chineke, Mosis kwuru okwu, na-echeghị echiche banyere ihe ọ na-ekwu.