Abụ Ọma 106

Ha fere arụsị ha ofufe, nke ghọrọ ihe ịma nʼọnya nye ha.

Psalm 106:36 (UKJV) And they served their idols: which were a snare unto them.

34Ha egbuchapụghị mba niile bi nʼala ahụ dịka Onyenwe anyị dọrọ ha aka na ntị ka ha mee.

35Kama ha gwakọtara onwe ha na mba niile nke ala ahụ, site otu a, mụta ime ka ha na-eme.

36Ha fere arụsị ha ofufe, nke ghọrọ ihe ịma nʼọnya nye ha.

37Ha gara nʼihu were ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom chụọrọ chi na-abụghị chi aja.

38Ha na-awụfu ọbara ndị na-emeghị ihe ọbụla, ọbara ụmụ ha ndị ikom na ndị inyom, bụ ndị ha chụrụ dịka aja nye arụsị niile nke ala Kenan, si otu a jiri ọbara ha merụọ ala ahụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.