Abụ Ọma 106

Ha egbuchapụghị mba niile bi nʼala ahụ dịka Onyenwe anyị dọrọ ha aka na ntị ka ha mee.

Psalm 106:34 (UKJV) They did not destroy the nations, concerning whom the LORD commanded them:

32Nʼakụkụ mmiri Meriba, ha kpasuru Onyenwe anyị iwe, nʼihi ha, nsogbu dakwasịrị Mosis;

33nʼihi na ha nupuru isi megide Mmụọ nke Chineke, Mosis kwuru okwu, na-echeghị echiche banyere ihe ọ na-ekwu.

34Ha egbuchapụghị mba niile bi nʼala ahụ dịka Onyenwe anyị dọrọ ha aka na ntị ka ha mee.

35Kama ha gwakọtara onwe ha na mba niile nke ala ahụ, site otu a, mụta ime ka ha na-eme.

36Ha fere arụsị ha ofufe, nke ghọrọ ihe ịma nʼọnya nye ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.