Abụ Ọma 106

Ọ raara ha nye nʼaka ndị mba ọzọ dị iche iche, ndị kpọrọ ha asị chịkwara ha.

Psalm 106:41 (UKJV) And he gave them into the hand of the heathen; and they that hated them ruled over them.

39Ha sitere nʼihe ha na-eme merụọ onwe ha; site nʼaka ọrụ ha, maka uru ha nyefere onwe ha nʼaka ndị na-emerụ ha.

40Nʼihi nke a, iwe were Onyenwe anyị megide ndị ya; ọ gụkwara ihe nketa ya dịka ihe rụrụ arụ.

41Ọ raara ha nye nʼaka ndị mba ọzọ dị iche iche, ndị kpọrọ ha asị chịkwara ha.

42Ndị iro ha mekpara ha ahụ chie ha ọnụ nʼala nʼokpuru ike ha.

43Ọtụtụ oge, ọ napụtara ha, ma ha nọgidesịrị ike nʼinupu isi site na ndụmọdụ ya, bụrụ ndị lara nʼiyi nʼime mmehie ha.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.