Abụ Ọma 106

Ndị iro ha mekpara ha ahụ chie ha ọnụ nʼala nʼokpuru ike ha.

Psalm 106:42 (UKJV) Their enemies also oppressed them, and they were brought into subjection under their hand.

40Nʼihi nke a, iwe were Onyenwe anyị megide ndị ya; ọ gụkwara ihe nketa ya dịka ihe rụrụ arụ.

41Ọ raara ha nye nʼaka ndị mba ọzọ dị iche iche, ndị kpọrọ ha asị chịkwara ha.

42Ndị iro ha mekpara ha ahụ chie ha ọnụ nʼala nʼokpuru ike ha.

43Ọtụtụ oge, ọ napụtara ha, ma ha nọgidesịrị ike nʼinupu isi site na ndụmọdụ ya, bụrụ ndị lara nʼiyi nʼime mmehie ha.

44Ma mgbe ọ nụrụ mkpu akwa ha, ọnọdụ mkpagbu ha metụtara ya;

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.