42Ndị iro ha mekpara ha ahụ chie ha ọnụ nʼala nʼokpuru ike ha.
43Ọtụtụ oge, ọ napụtara ha, ma ha nọgidesịrị ike nʼinupu isi site na ndụmọdụ ya, bụrụ ndị lara nʼiyi nʼime mmehie ha.
44Ma mgbe ọ nụrụ mkpu akwa ha, ọnọdụ mkpagbu ha metụtara ya;
45nʼihi ha, o chetara ọgbụgba ndụ ya, sitekwa nʼoke ịhụnanya ya, meere ha ebere.
46Ọ na-emekwa ka ndị ahụ dọtara ha nʼagha nwee ọmịiko nʼahụ ha.