Abụ Ọma 106

Ọ na-emekwa ka ndị ahụ dọtara ha nʼagha nwee ọmịiko nʼahụ ha.

Psalm 106:46 (UKJV) He made them also to be pitied of all those that carried them captives.

44Ma mgbe ọ nụrụ mkpu akwa ha, ọnọdụ mkpagbu ha metụtara ya;

45nʼihi ha, o chetara ọgbụgba ndụ ya, sitekwa nʼoke ịhụnanya ya, meere ha ebere.

46Ọ na-emekwa ka ndị ahụ dọtara ha nʼagha nwee ọmịiko nʼahụ ha.

47O Onyenwe anyị Chineke anyị, zọpụta anyị, chịkọta anyị site nʼaka mba dị iche iche, ka anyị nwee ike nye aha nsọ gị ekele ma nyaakwa isi nʼime otuto gị.

48Otuto dịrị Onyenwe anyị, bụ Chineke nke Izrel, site nʼebighị ebi ruo ebighị ebi. Ka mmadụ niile sị, “Amen!” Toonu Onyenwe anyị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.