18Ihe oriri ọbụla ghọọrọ ha ihe rụrụ arụ ha bịakwara ọnụ ụzọ ama ọnwụ nso.
19Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị nʼime nsogbu ha ọ zọpụtara ha site na mkpagbu ahụ niile.
20O zipụrụ okwu ọnụ ya, gwọọ ha; ọ napụtara ha site nʼili.
21Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ.
22Ka ha chụọ aja ekele nye ya jirikwa ọtụtụ abụ ọṅụ kwupụta banyere ọrụ ya niile.