22Ka ha chụọ aja ekele nye ya jirikwa ọtụtụ abụ ọṅụ kwupụta banyere ọrụ ya niile.
23Ụfọdụ ji ụgbọ mmiri na-ejegharị nʼelu oke osimiri; ha bụ ndị na-azụ ahịa ma na-ebugharịkwa ngwa ahịa nʼelu oke osimiri.
24Ha hụrụ ọrụ niile nke Onyenwe anyị, ọtụtụ ọrụ ebube ya nʼogbu mmiri.
25Nʼihi na o kwuru okwu mere ka oke ifufe kuo nke buliri ebili mmiri elu.
26Ha bụ ndị e buliri nnọọ ezigbo elu, ma budatakwa ruo ogbu mmiri niile; nʼọnọdụ ihe egwu ahụ, obi lọrọ ha mmiri.