4Ụfọdụ wagharịrị nʼọzara, ala nke tọgbọrọ nʼefu, ha enweghị ike ịchọta ụzọ nke ga-eduba ha nʼobodo ebe ha ga-ebi.
5Agụụ gụrụ ha, akpịrị kpọkwara ha nkụ, olileanya gwụrụ ha nʼobi.
6Mgbe ahụ, ha kpọkuru Onyenwe anyị, nʼime nsogbu ha, ọ napụtakwara ha site na mkpagbu ha niile.
7O duuru ha nʼụzọ ziri ezi baa nʼobodo ha ga-ebi.
8Ka ha kelee Onyenwe anyị nʼihi ịhụnanya ya nke na-adịghị agwụ agwụ na nʼihi ọrụ ebube ya niile nye ụmụ mmadụ,