13Kama ka ụmụ ụmụ ya niile nwụsịa, ka a ehichapụkwa aha ha nʼọgbọ nke na-abịa nʼihu.
14Ka Onyenwe anyị chetakwa mmehie niile nke nna nna ya ha, ka Onyenwe anyị hapụkwa ịgbaghara mmehie nne ya.
15Ka Onyenwe anyị na-echeta mmehie ha oge niile; ma ka o mee ka ha bụrụ ndị a ga-echefu echefu nʼọgbọ niile.
16Nʼihi na ọ dịghị mgbe o chere echiche banyere imere onye ọzọ obi ebere, ọ kpagburu ndị ogbenye, ndị nọ na mkpa na ndị obi ha tiwara etiwa ruo nʼọnwụ.
17Ọ hụrụ ịbụ ndị ọzọ ọnụ nʼanya, ka ọbụbụ ọnụ bịakwasị ya; ọ dịghị atọ ya ụtọ ịgọzi onye ọbụla, ka ngọzị dị anya site nʼebe ọ nọ.