11Ka ndị o ji ụgwọ kwakọrọ ihe niile o nwere, ka ndị ọbịa baa bukọrọ ihe niile ọ rụpụtaara onwe ya.
12Ka onye ọbụla ghara igosi ya obiọma; ka onye ọbụla gharakwa imere ụmụ ya ndị ọ hapụrụ ebere.
13Kama ka ụmụ ụmụ ya niile nwụsịa, ka a ehichapụkwa aha ha nʼọgbọ nke na-abịa nʼihu.
14Ka Onyenwe anyị chetakwa mmehie niile nke nna nna ya ha, ka Onyenwe anyị hapụkwa ịgbaghara mmehie nne ya.
15Ka Onyenwe anyị na-echeta mmehie ha oge niile; ma ka o mee ka ha bụrụ ndị a ga-echefu echefu nʼọgbọ niile.