19Ka ọ dịịrị ya ka uwe mwụda nke e kere ya gburugburu dịka akwa, dịka belịt e kegidere ya gburugburu ruo mgbe ebighị ebi.
20Onyenwe anyị, mee ka nke a bụrụ ụdị ụgwọ ọrụ ndị iro m ga-anata, bụ ndị ahụ niile na-ekwu okwu ọjọọ megide m.
21Ma gị onwe gị, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị nyere m aka nʼihi aha gị, site nʼịdị mma nke ịhụnanya gị, napụta m.
22Nʼihi na abụ m ogbenye na onye nọ na mkpa, obi m tiwakwara etiwa nʼime m.
23Ana m efu dịka onyinyo nke a na-ahụ anya mgbe anwụ dara; adịkwa m ka igurube nke onye m bekwasịrị nʼahụ ya na-efechapụ.