7Ọrụ aka ya niile bụ ihe kwesiri ekwesi na ikpe ziri ezi; ụkpụrụ ya niile bụ ihe kwesiri ntụkwasị obi.
8E hiwere ha ịdị ruo mgbe niile ebighị ebi, ha bụ ihe e mere nʼikwesị ntụkwasị obi na izi ezi.
9O wetaara ndị ya mgbapụta; o meela ka ọgbụgba ndụ ya guzosie ike ruo ebighị ebi, aha ya dị nsọ dịkwa oke egwu.
10Ịtụ egwu Onyenwe anyị bụ mmalite amamihe; ndị niile na-edebe ụkpụrụ ya nwere ezi nghọta. Otuto ya na-adị ruo mgbe ebighị ebi.