3Chineke anyị bi nʼeluigwe. Ọ bụkwa ihe tọrọ ya ụtọ nʼobi ka ọ na-eme.
4Arụsị ha niile bụ ọlaọcha na ọlaedo ka e ji kpụọ ha, ha bụ ọrụ aka mmadụ.
5Ha nwere ọnụ ma ha adịghị ekwu okwu, ha nwere anya abụọ ma ha adịghị ahụ ụzọ;
6ha nwere ntị ma ha adịghị anụ ihe, ha nwekwara imi ma ha adịghị anụ isisi ọbụla;
7ha nwere aka, ma ha adịghị emetụ ihe ọbụla aka, ha nwere ụkwụ, ma ha adịghị eje ije; ha enweghị ike iji akpịrị ha mee mkpọtụ ọbụla.