2Gịnị mere ọtụtụ mba niile nke ụwa ji na-ajụ sị, “Olee ebe Chineke ha nọ?”
3Chineke anyị bi nʼeluigwe. Ọ bụkwa ihe tọrọ ya ụtọ nʼobi ka ọ na-eme.
4Arụsị ha niile bụ ọlaọcha na ọlaedo ka e ji kpụọ ha, ha bụ ọrụ aka mmadụ.
5Ha nwere ọnụ ma ha adịghị ekwu okwu, ha nwere anya abụọ ma ha adịghị ahụ ụzọ;
6ha nwere ntị ma ha adịghị anụ ihe, ha nwekwara imi ma ha adịghị anụ isisi ọbụla;