Abụ Ọma 115

Gịnị mere ọtụtụ mba niile nke ụwa ji na-ajụ sị, “Olee ebe Chineke ha nọ?”

Psalm 115:2 (UKJV) Wherefore should the heathen say, Where is now their God?

1Ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, o Onyenwe anyị, ọ bụghị anyị ka ọ dịrị, kama ọ bụ aha gị ka ebube na-adịrị, nʼihi ịhụnanya gị na ikwesi ntụkwasị obi gị.

2Gịnị mere ọtụtụ mba niile nke ụwa ji na-ajụ sị, “Olee ebe Chineke ha nọ?”

3Chineke anyị bi nʼeluigwe. Ọ bụkwa ihe tọrọ ya ụtọ nʼobi ka ọ na-eme.

4Arụsị ha niile bụ ọlaọcha na ọlaedo ka e ji kpụọ ha, ha bụ ọrụ aka mmadụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.