10Eji m obi m niile na-achọsi gị ike. Ekwela ka m kpafuo site nʼihe niile i nyere nʼiwu.
11Ezoola m okwu gị niile nʼobi m, igbochi m imehie imegide gị.
12Otuto dịrị gị, o Onyenwe anyị; kuziere m iwu gị niile.
13Aga m eji egbugbere ọnụ m gụgharịa iwu niile nke si nʼọnụ gị.
14Ana m aṅụrị ọṅụ nʼịgbaso iwu gị niile dịka mmadụ si aṅụrị ọṅụ nʼime oke ịba ụba.