121Emeela m ihe dị mma na ihe ziri ezi; ahapụkwala m nʼaka ndị na-emegbu m.
122Kwee ohu gị nkwa na ị ga-elekọta ya; ekwela ka ndị mpako kpagbuo m.
123Anya na-egbu m mgbu ebe m na-ele anya nzọpụta gị ebe m na-ele anya nkwa gị ziri ezi.
124Biko mesoo ohu gị mmeso dịka ịhụnanya gị si dị ma kuziekwara m ụkpụrụ gị niile.
125Abụ m ohu gị, nye m nghọta, ka m nwee ike mara ụkpụrụ gị niile.