148Ana m amụ anya abalị nʼelu ihe ndina m, nʼihi ịtụgharị uche na nkwa gị niile.
149Nụrụ olu m dịka ịhụnanya gị si dị; chebe ndụ m, o Onyenwe anyị, dịka iwu gị niile si dị.
150Ndị na-atụpụta atụmatụ ọjọọ nọ nso ma ha nọ iwu gị niile nʼebe dị anya.
151Ma ị nọ nso, Onyenwe anyị; ihe niile i nyere nʼiwu bụ eziokwu.
152Site na mgbe ochie ka m mụtara site nʼụkpụrụ gị, na i mere ka ha guzosie ike ruo mgbe ebighị ebi.