162Ana m aṅụrị ọṅụ nʼime nkwa gị dịka onye chọtara ọtụtụ ihe nkwata nʼagha.
163Akpọrọ m okwu ụgha asị, ọ bụkwa ihe arụ nʼebe m nọ, ma ahụrụ m iwu gị nʼanya.
164Aga m eto gị ugboro asaa nʼụbọchị, nʼihi iwu gị ziri ezi.
165Ndị hụrụ iwu gị nʼanya nwere udo dị ukwuu, ọ dịghị ihe ga-eme ka ha sụọ ngọngọ.
166Ana m echere nzọpụta gị, o Onyenwe anyị, na-agbasokwa iwu gị niile.