167Ana m erubere ụkpụrụ gị niile isi nʼihi na m hụrụ ha nʼanya nke ukwuu.
168Ana m erubere ụkpụrụ na iwu gị niile isi, nʼihi na ị maara ụzọ m niile.
169Ka akwa m ruo gị ntị, o Onyenwe anyị; nye m nghọta dịka okwu gị si dị.
170Ka arịrịọ m ruo gị ntị; gbapụta m dịka nkwa gị si dị.
171Ka ọnụ m jupụta nʼotuto, nʼihi na ị na-ezi m iwu gị niile.