18Kpughee anya m abụọ ka m hụ oke ihe ebube niile dị iche iche dị nʼime okwu gị.
19Abụ m onye ọbịa nʼelu ụwa; ezonarịla m iwu gị niile.
20Nʼoge niile, ihe banyere iwu gị niile na-agụ mkpụrụobi m agụụ.
21Ị na-abara ndị mpako mba, ha bụ ndị a bụrụ ọnụ na ndị na-anaghị agbaso iwu gị.
22Site nʼebe m nọ wepụ ịchị ọchị na nlelị, nʼihi na m na-edebe ụkpụrụ gị niile.