21Ị na-abara ndị mpako mba, ha bụ ndị a bụrụ ọnụ na ndị na-anaghị agbaso iwu gị.
22Site nʼebe m nọ wepụ ịchị ọchị na nlelị, nʼihi na m na-edebe ụkpụrụ gị niile.
23Nʼagbanyeghị na ndịisi nọkọrọ na-ekwulu m, ohu gị ga-atụgharị uche nʼiwu gị.
24Ụkpụrụ gị niile bụ ihe na-amasị m; ha bụ ndị ndụmọdụ m.
25Mkpụrụobi m na-arapara nʼuzuzu; kpọghachite ndụ m dịka okwu gị si dị.