24Ụkpụrụ gị niile bụ ihe na-amasị m; ha bụ ndị ndụmọdụ m.
25Mkpụrụobi m na-arapara nʼuzuzu; kpọghachite ndụ m dịka okwu gị si dị.
26Akọwaara m gị ụzọ m niile, ị zakwara m; ugbu a, kuziere m iwu gị.
27Mee ka m ghọta ozizi ụkpụrụ gị; ka m nwe ike tụgharịa uche nʼọrụ ebube gị niile.
28Iru ụjụ emeela ka mkpụrụobi m daa mba; gbaa m ume dịka okwu gị si dị.