28Iru ụjụ emeela ka mkpụrụobi m daa mba; gbaa m ume dịka okwu gị si dị.
29Chebe m pụọ nʼụzọ aghụghọ niile; site nʼiwu gị meere m amara.
30Ahọrọla m ụzọ ikwesi ntụkwasị obi; e kpebiela m idebe obi m nʼiwu gị niile.
31O Onyenwe anyị, ana m ejigidesi iwu gị niile aka ike; ekwela ka ihere mee m.
32Aga m agbaso iwu gị niile nʼihi na i meela ka obi m nwere onwe ya.