Abụ Ọma 119

Mezuo nkwa i kwere ohu gị, ka a tụọ egwu gị.

Psalm 119:38 (UKJV) Establish your word unto your servant, who is devoted to your fear.

36Mee ka obi m chee ihu nʼiwu gị niile ọ bụghị nye uru na-esite nʼọchịchọ nke onwe.

37Wepụ anya m site nʼihe na-abaghị uru; chebe ndụ m dịka okwu gị si dị.

38Mezuo nkwa i kwere ohu gị, ka a tụọ egwu gị.

39Wepụ nkọcha nke m na-atụ egwu ya, nʼihi na iwu gị niile ziri ezi.

40Ụkpụrụ gị na-agụsị m agụụ ike! Chebe ndụ m site nʼezi omume gị.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.