60Aga m eme ngwangwa, agaghị atụfu oge irubere iwu gị niile isi.
61A sịkwarị na ndị ajọ omume ejiri ụdọ kee m agbụ, agaghị m echefu iwu gị.
62Nʼetiti abalị, aga m ebili nye gị ekele nʼihi iwu gị niile ziri ezi.
63Abụ m enyi ndị niile na-atụ egwu gị, ndị niile na-agbaso ụkpụrụ gị.
64O Onyenwe anyị, ụwa niile jupụtara nʼịhụnanya gị; kuziere m iwu gị niile.