77Ka ọmịiko gị bịakwasị m, ka m nwee ike dị ndụ, nʼihi na iwu gị na-amasị m.
78Ka ihere mee ndị mpako nʼihi ihe ọjọọ ha mere m na-enweghị ihe m mere; ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị.
79Ka ndị niile na-atụ egwu gị bịakwute m, ndị na-aghọta ụkpụrụ gị niile.
80Ka m were obi zuruoke na-agbaso ụkpụrụ gị niile, ka ihere ghara ime m.
81Mkpụrụobi m na-ada mba site nʼọchịchọ ya maka nzọpụta gị, ma olileanya m dị nʼokwu gị.