Abụ Ọma 119

Ruo taa, iwu gị niile na-eguzosi ike, nʼihi na ihe niile na-ejere gị ozi.

Psalm 119:91 (UKJV) They continue this day according to yours ordinances: for all are your servants.

89O Onyenwe anyị, okwu gị na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi; ọ na-eguzosi ike nʼeluigwe.

90Ikwesi ntụkwasị obi gị na-adịgide site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ; ọ bụ gị kere ụwa, ọ na-eguzosikwa ike.

91Ruo taa, iwu gị niile na-eguzosi ike, nʼihi na ihe niile na-ejere gị ozi.

92A sịkwarị na iwu gị anaghị amasị m, agaara m anwụ nʼime nsogbu m.

93Agaghị m echefu ụkpụrụ gị niile, nʼihi na ọ bụ ha ka i ji chebe ndụ m.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.