91Ruo taa, iwu gị niile na-eguzosi ike, nʼihi na ihe niile na-ejere gị ozi.
92A sịkwarị na iwu gị anaghị amasị m, agaara m anwụ nʼime nsogbu m.
93Agaghị m echefu ụkpụrụ gị niile, nʼihi na ọ bụ ha ka i ji chebe ndụ m.
94Zọpụta m, nʼihi na abụ m nke gị; achọpụtala m ụkpụrụ gị niile.
95Ndị ajọ omume na-eche ịla m nʼiyi, ma aga m atụgharị uche nʼụkpụrụ gị.