12ọ bụrụ na ụmụ ndị ikom gị edebe ọgbụgba ndụ m na ụkpụrụ niile m kuziri ha, mgbe ahụ ụmụ ha ga-anọdụ ala nʼocheeze gị ruo mgbe ebighị ebi.”
13Nʼihi na Onyenwe anyị ahọrọla Zayọn, ọ bụ ọchịchọ obi ya ime ya ebe obibi ya;
14“Ebe a bụ ebe izuike m ruo mgbe ebighị ebi, ebe a ka ocheeze m ga-adịkwa, nʼihi na ọ bụ ihe m chọrọ.
15Aga m eji ọtụtụ nri dị iche iche gọzie ya; aga m eji nri mee ka afọ ju ndị ogbenye ya.
16Aga m eji nzọpụta yinye ndị nchụaja ya niile dịka uwe, ndị nsọ ya ga-abụ abụ nʼihi ọṅụ.