Abụ Ọma 132

Aga m eji ọtụtụ nri dị iche iche gọzie ya; aga m eji nri mee ka afọ ju ndị ogbenye ya.

Psalm 132:15 (UKJV) I will abundantly bless her provision: I will satisfy her poor with bread.

13Nʼihi na Onyenwe anyị ahọrọla Zayọn, ọ bụ ọchịchọ obi ya ime ya ebe obibi ya;

14“Ebe a bụ ebe izuike m ruo mgbe ebighị ebi, ebe a ka ocheeze m ga-adịkwa, nʼihi na ọ bụ ihe m chọrọ.

15Aga m eji ọtụtụ nri dị iche iche gọzie ya; aga m eji nri mee ka afọ ju ndị ogbenye ya.

16Aga m eji nzọpụta yinye ndị nchụaja ya niile dịka uwe, ndị nsọ ya ga-abụ abụ nʼihi ọṅụ.

17“Nʼebe a ka m ga-eme ka mpi puputara Devid ma debekwa oriọna nʼihi onye m e tere mmanụ.

Biblica® Open Igbo Contemporary Bible™ Copyright © 1980, 1988, 2019, 2020 by Biblica, Inc. Licensed CC BY-SA 4.0. “Biblica” is a trademark registered in the United States Patent and Trademark Office by Biblica, Inc.