7“Ka anyị gaa na-ebe obibi ya; ka anyị kpọọ isiala nʼebe ihe mgbakwasị ụkwụ ya.
8‘Bilie, Onyenwe anyị, bata nʼebe izuike gị, gị na igbe ọgbụgba ndụ nke ike gị.
9Ka ndị nchụaja gị yiri ezi omume gị dịka uwe; ka ndị gị kwesiri ntụkwasị obi bụọ abụ nʼihi ọṅụ.’ ”
10Nʼihi ohu gị, bụ Devid, agbakụtala onye gị e tere mmanụ azụ.
11Onyenwe anyị ṅụrụ Devid iyi nʼeziokwu, bụ iyi nke ọ gaghị esi na ya laghachi azụ: “Otu nʼime ụmụ gị, ka m ga-eme ka ọ nọdụ nʼocheeze gị,