1O Onyenwe anyị, ị nyochaala m, ị makwaara m nke ọma
2Ị maara mgbe m na-anọdụ ala na mgbe m na-eguzo ọtọ; site nʼebe dị anya, ị na-aghọta echiche obi m niile.
3Ị na-ahụzu ọpụpụ m na ndina ala m; ị mazukwara ụzọ m niile.
4O Onyenwe anyị, ị maara ihe m gaje ikwu tupu m kwuo ya.