12ka mmadụ niile mata ihe banyere ọrụ ukwuu gị niile dị iche iche na ebube nke ịdị mma alaeze gị.
13Alaeze gị bụ alaeze na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi, ọchịchị gị na-adịgidekwa site nʼọgbọ ruo nʼọgbọ. Onyenwe anyị na-emezu nkwa ya niile na-ahụkwa ihe niile o kere eke nʼanya.
14Onyenwe anyị na-ekulite ndị niile dara ada na-akwagide ndị niile dara mba.
15Olileanya ihe niile dị na gị, ị na-enye ha nri ha mgbe oge ya ruru.
16I na-asaghepụ aka gị na-emezu ọchịchọ ihe niile dị ndụ.